Ọpụpụ 32

Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị Chineke ya arịrịọ sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gịnị mere iwe gị ji dị ọkụ otu a nʼebe ndị gị nọ bụ ndị nke i ji ike ebube gị, na ọtụtụ ihe ịrịbama dị ịtụnanya, dupụta site nʼala Ijipt?

Exodus 32:11 (UKJV) And Moses besought the LORD his God, and said, LORD, why does your wrath wax hot against your people, which you have brought forth out of the land of Egypt with great power, and with a mighty hand?

9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike, na ndị na-enupu isi.

10Ugbu a, hapụ m ka iwe m bịakwasị ha, ka m laa ha nʼiyi. Aga m eme ka gị onwe gị bụ Mosis bụrụ mba ukwu nʼọnọdụ ha.”

11Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị Chineke ya arịrịọ sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gịnị mere iwe gị ji dị ọkụ otu a nʼebe ndị gị nọ bụ ndị nke i ji ike ebube gị, na ọtụtụ ihe ịrịbama dị ịtụnanya, dupụta site nʼala Ijipt?

12Nʼihi gịnị ka ndị Ijipt ga-ekwu sị, ‘Ọ bụghị ime ha ihe ọjọọ ka o ji dupụta ha, ka o nwee ike gbuo ha nʼugwu ndị a, ma kpochapụkwa ha site nʼelu ụwa a?’ Site nʼiwe gị dị ọkụ chigharịa, kwere ka ọ dajụọ. Chigharịakwaa site nʼatụmatụ ọjọọ a nʼebe ndị gị nọ.

13Cheta nkwa ahụ i kwere ndị ohu gị bụ Ebraham, Aịzik, na Izrel. Nʼihi na i ji onwe gị ṅụọ iyi nye ha sị, ‘Aga m eme ka mkpụrụ gị mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. Aga m enye ha ala m kwere ụmụ ụmụ gị na nkwa ka ọ bụrụ ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.