18Ma Mosis zara sị, “Mba, nke a abụghị ụzụ ndị meriri nʼagha, maọbụ ụzụ ndị e meriri nʼagha, kama ọ bụ olu abụ ka m na-anụ.”
19Mgbe Mosis bịaruru nso ebe ahụ ha mara ụlọ ikwu ha, hụ nwa oke ehi ahụ a kpụrụ akpụ na egwu a na-ete, iwe were ya nke ukwuu. Ọ tụpụrụ mbadamba nkume ndị ahụ o ji nʼaka. Kụrie ha na ndịda ugwu ahụ.
20Mosis weere nwa oke ehi ahụ ha kpụrụ akpụ, kpọọ ya ọkụ. Mgbe ahụ, o gweriri ya dịka ntụ. Fesaa ya nʼelu mmiri mee ka ụmụ Izrel ṅụọ mmiri ahụ.
21Ọ gwara Erọn okwu sị, “Gịnị ka ndị a mere gị i ji bute ụdị mmehie ọjọọ dị otu a tụkwasị ha nʼisi?”
22“Erọn zara sị ya, ka iwe gị ghara ịdị ọkụ, onyenwe m. Gị onwe gị maara ndị a, mata otu ha si bụrụ ndị ọjọọ.