Ọpụpụ 32

Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nwoke ọbụla nyara mma agha ya nʼakụkụ ya, jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel, site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ. Ya gbuo ọbụladị nwanne ya nwoke, maọbụ enyi ya, maọbụ onye agbataobi ya.’ ”

Exodus 32:27 (UKJV) And he said unto them, Thus says the LORD God of Israel, Put every man his sword by his side, and go in and out from gate to gate throughout the camp, and slay every man his brother, and every man his companion, and every man his neighbour.

25Mosis hụrụ na omume ndị a jọgbuziri onwe ya na njọ nʼihi na Erọn mere ka isi kopu ha. Nke mere ka ha bụrụzia ihe ọchị nʼebe ndị iro ha dị.

26O guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ahụ kwuo sị, “Onye ọbụla dịnyeere Onyenwe anyị ya bịakwute m.” Ndị Livayị niile bịakwutere ya.

27Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nwoke ọbụla nyara mma agha ya nʼakụkụ ya, jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel, site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ. Ya gbuo ọbụladị nwanne ya nwoke, maọbụ enyi ya, maọbụ onye agbataobi ya.’ ”

28Ndị Livayị mezuru ihe Mosis gwara ha. Ya mere ndị nwụrụ nʼụbọchị ahụ dị puku mmadụ atọ.

29Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Livayị okwu sị, “Taa, unu ekewapụtala onwe unu nye Onyenwe anyị. Nʼihi na unu gburu ụmụ unu ndị ikom na ụmụnne unu ndị ikom. Ugbu a, ọ gọziela unu taa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.