3Ngwangwa, ha niile yipụrụ ọlantị ha weta ha nye Erọn.
4Ọ naara ya nʼaka ha, were ngwa ọrụ e ji egbunye akara, kpụtara ha arụsị nwa oke ehi. Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke sitere nʼala Ijipt dupụta unu.”
5Mgbe Erọn hụrụ na ụmụ Izrel jupụtara nʼobi aṅụrị, nʼihi ihe ahụ ọ kpụrụ, o wuru ebe ịchụ aja nʼihu nwa ehi ahụ ọ kpụrụ, kwuo okwu sị, “Echi, a ga-enwe oke mmemme nye Onyenwe anyị!”
6Ya mere na echi ya, ha biliri nʼoge, bido ịchụ aja nsure ọkụ, na aja udo, nye nwa ehi ahụ a kpụrụ akpụ. Mgbe nke a gasịrị, ha nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.
7Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Gbada ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i dupụtara site nʼIjipt emerụọla onwe ha.