5Mgbe Erọn hụrụ na ụmụ Izrel jupụtara nʼobi aṅụrị, nʼihi ihe ahụ ọ kpụrụ, o wuru ebe ịchụ aja nʼihu nwa ehi ahụ ọ kpụrụ, kwuo okwu sị, “Echi, a ga-enwe oke mmemme nye Onyenwe anyị!”
6Ya mere na echi ya, ha biliri nʼoge, bido ịchụ aja nsure ọkụ, na aja udo, nye nwa ehi ahụ a kpụrụ akpụ. Mgbe nke a gasịrị, ha nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.
7Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Gbada ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i dupụtara site nʼIjipt emerụọla onwe ha.
8Nʼotu ntabi anya a, ha ahapụla ụzọ m niile. Ha akpụọlara onwe ha arụsị nwa oke ehi, nke ha na-efe ofufe, nke ha chụkwaara aja nye. Ha kwukwara sị, ‘Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke dupụtara unu site nʼala Ijipt.’ ”
9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike, na ndị na-enupu isi.