Ọpụpụ 33

Mgbe Mosis na Onyenwe anyị nọ na-ekwurịta okwu, ihe Mosis gwara ya bụ nke a, “Ọ dịla anya kemgbe ị na-agwa m sị m, ‘Duru ndị m baa nʼala ahụ e kwere na nkwa inye ha.’ Ma matakwa na ị gwabeghị m onye ị ga-edunyere m ga-eduzi m ụzọ. I kwuola na ị maara aha m, kwukwaa na achọtala m ihuọma nʼebe ị nọ.

Exodus 33:12 (UKJV) And Moses said unto the LORD, See, you says unto me, Bring up this people: and you have not let me know whom you will send with me. Yet you have said, I know you by name, and you have also found grace in my sight.

10Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala.

11Nʼime ụlọ nzute ahụ, Onyenwe anyị na-agwa Mosis okwu ihu na ihu, dịka mmadụ sị agwa enyi ya okwu. Mgbe ha kparịchara ụka, Mosis na-alọghachi azụ nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Ma nwokorobịa ahụ na-enyere ya aka, bụ Joshua, nwa Nun, na-anọgide nʼụlọ ikwu nzute ahụ.

12Mgbe Mosis na Onyenwe anyị nọ na-ekwurịta okwu, ihe Mosis gwara ya bụ nke a, “Ọ dịla anya kemgbe ị na-agwa m sị m, ‘Duru ndị m baa nʼala ahụ e kwere na nkwa inye ha.’ Ma matakwa na ị gwabeghị m onye ị ga-edunyere m ga-eduzi m ụzọ. I kwuola na ị maara aha m, kwukwaa na achọtala m ihuọma nʼebe ị nọ.

13Biko, ọ bụrụ na o si otu a dị, zi m ụzọ gị, nke ga-eme ka m mata gị, gaakwa nʼihu inweta ihuọma site nʼebe ị nọ. Chetakwa na mba a dị ukwu bụ ndị gị.”

14Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.