14Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.”
15Mgbe ahụ Mosis sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị gaghị eso anyị nʼije a, ekwela ka anyị si nʼebe a zọpụ ụkwụ.
16Ọ bụrụ na i soghị anyị, olee otu a ga-esi mata na mụ onwe m, na ndị gị achọtala ihuọma gị? Olee otu ọ ga-esi pụta ìhè na mụ na ndị gị bụ mba dị iche site na mba ndị ọzọ dị nʼụwa?”
17Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị, “E, aga m eme ihe ị rịọrọ m, nʼihi na ị chọtala ihuọma m. Nʼezie, amara m onye ị bụ, marakwa aha gị.”
18Mgbe ahụ, Mosis rịọrọ sị, “Gosi m ebube gị.”