18Mgbe ahụ, Mosis rịọrọ sị, “Gosi m ebube gị.”
19Ma Onyenwe anyị zara sị, “Aga m eme ka ị hụ ịdị mma m, aga m akọwakwara gị ihe aha m bụ Onyenwe anyị pụtara. Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.
20Ma ị pụghị ịhụ ihu m nʼihi na mmadụ ọbụla enweghị ike ịhụ ihu m ma dịrịkwa ndụ.”
21Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Lee, e nwere ebe dị nso nʼakụkụ m, nʼelu nkume, ebe i nwere ike iguzo.
22Mgbe ebube m ga-agafe, aga m ezo gị nʼokpuru nkume, werekwa aka m kpuchie gị, tutu ruo mgbe m gafechara.