5Nʼihi na Onyenwe anyị agwala Mosis sị, “Gwa ụmụ Izrel, ‘Unu bụ ndị isiike. A sị na m nọ nʼetiti unu, otu ntabi anya ezuorola m ịla unu nʼiyi. Ugbu a, yipụnụ ihe ịchọ mma niile unu yi nʼahụ, aga m ekpebi ihe m ga-eme unu.’ ”
6Ya mere, ndị Izrel yipụrụ ihe ịchọ mma ha niile. Nʼugwu Horeb ka ha nọ mgbe ihe ndị a mere.
7Nʼoge a, Mosis na-ewere ụlọ ikwu manye nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ọ na-akpọ ya ụlọ nzute. Ọ na-amanye ya nʼebe dị anya site nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Onye ọ bụla nke chọrọ ịjụta Onyenwe anyị ase, na-apụ, gaa nʼụlọ nzute ahụ nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
8Mgbe ọbụla Mosis na-aga nʼụlọ ikwu nzute ahụ, ndị Izrel niile na-apụta guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ha, na-ele ya anya tutu Mosis abanye nʼụlọ ikwu ahụ.
9Mgbe ọ banyere nʼụlọ ikwu ahụ; ogidi igwe ojii ahụ na-abịa guzochie nʼọnụ ụzọ mgbe Onyenwe anyị na Mosis na-akparị ụka.