6Ya mere, ndị Izrel yipụrụ ihe ịchọ mma ha niile. Nʼugwu Horeb ka ha nọ mgbe ihe ndị a mere.
7Nʼoge a, Mosis na-ewere ụlọ ikwu manye nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ọ na-akpọ ya ụlọ nzute. Ọ na-amanye ya nʼebe dị anya site nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Onye ọ bụla nke chọrọ ịjụta Onyenwe anyị ase, na-apụ, gaa nʼụlọ nzute ahụ nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
8Mgbe ọbụla Mosis na-aga nʼụlọ ikwu nzute ahụ, ndị Izrel niile na-apụta guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ha, na-ele ya anya tutu Mosis abanye nʼụlọ ikwu ahụ.
9Mgbe ọ banyere nʼụlọ ikwu ahụ; ogidi igwe ojii ahụ na-abịa guzochie nʼọnụ ụzọ mgbe Onyenwe anyị na Mosis na-akparị ụka.
10Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala.