14Unu efela chi ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị, onye aha ya bụ Ekworo, bụ Chineke na-ekwo ekworo.
15“Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ ghara ịgba ndụ, nʼihi na mgbe ha na-akwaso chi ha iko, na-achụkwa aja nye chi ha, ha ga-akpọ unu oku nri, mgbe ahụ, unu ga-eri site nʼihe aja ha.
16Mgbe unu lụtara ụfọdụ ndị inyom ha dịka nwunye nye ụmụ unu ndị ikom, ndị inyom ndị a na-akwaso chi ha iko, ga-eme ka ụmụ unu ndị ikom soro ha nʼomume dị otu a.
17“Unu akpụla chi ọbụla.
18“Na-emenụ mmemme achịcha na-ekoghị eko. Rienụ achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa, dịka m nyere nʼiwu na a ga-eme nʼụbọchị ndị ahụ a họpụtara, nʼọnwa Abib, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta.