17“Unu akpụla chi ọbụla.
18“Na-emenụ mmemme achịcha na-ekoghị eko. Rienụ achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa, dịka m nyere nʼiwu na a ga-eme nʼụbọchị ndị ahụ a họpụtara, nʼọnwa Abib, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta.
19“Nwa nwoke ọbụla e bụ ụzọ mụọ bụ nke m, tinyere ụmụ anụ ụlọ, ma ehi, ma atụrụ, ma ewu.
20E nwere ike ịgbapụta nwa oke ịnyịnya ibu site nʼiwere nwa atụrụ dochie nʼọnọdụ ya. Ọ bụrụ na i kpebie na ị gaghị agbapụta ya, mgbe ahụ, ị ga-agbaji olu ya. Ma ụmụ unu ndị ikom niile ka a ga-agbapụta. “O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abịa guzo m nʼihu na-ejighị onyinye.
21“Nʼoge ịkụ ihe nʼubi na nʼoge owuwe ihe ubi, rụọnụ ọrụ naanị ụbọchị isii. Zukwanụ ike nʼụbọchị nke asaa.