22“Mee Mmemme Izu Ụka asaa, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ọka wiiti mee, na Mmemme Nchịkọta Ihe nʼọgwụgwụ afọ ọbụla.
23Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nke Izrel.
24Nʼihi na aga m esite nʼihu unu chụpụ mba dị iche iche. Meekwa ka ala unu saa mbara. Ọ dịghị onye ọbụla ga-enwe anya ukwu nʼebe ala unu dị, mgbe unu na-aga iche onwe unu nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ugbo atọ nʼafọ.
25“Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nye m. Unu ahapụkwala aja sitere na Mmemme Ngabiga ka ọ nọọ ruo ụtụtụ.
26“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma nʼụlọ Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.”