Ọpụpụ 34

Mgbe Mosis ji mbadamba nkume abụọ nke ihe ama ahụ na-arịdata site nʼelu ugwu ahụ, ọ mataghị na ihu ya na-egbuke egbuke, nʼihi ọnọdụ nke ọ nọrọ nʼihu Onyenwe anyị.

Exodus 34:29 (UKJV) And it came to pass, when Moses came down from mount Sinai with the two tables of testimony in Moses' hand, when he came down from the mount, that Moses know not that the skin of his face shone while he talked with him.

27Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Dee iwu ndị a m nyere gị, nʼihi na dịka okwu ndị a si dị, ka ọgbụgba ndụ mụ na gị na ụmụ Izrel gbara si dị.”

28Mosis na Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Ma nʼoge ndị a niile o righị nri ọbụla. Ọ ṅụkwaghị ihe ọṅụṅụ ọbụla. O dere na mbadamba nkume abụọ ahụ okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke bụ iwu iri ahụ.

29Mgbe Mosis ji mbadamba nkume abụọ nke ihe ama ahụ na-arịdata site nʼelu ugwu ahụ, ọ mataghị na ihu ya na-egbuke egbuke, nʼihi ọnọdụ nke ọ nọrọ nʼihu Onyenwe anyị.

30Nʼihi mgbuke ahụ ihu Mosis na-egbuke, ụjọ ekweghị Erọn na ụmụ Izrel bịaruo ya nso.

31Ma Mosis kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Nʼihi ya, Erọn na ndị ndu nzukọ Izrel bịara ka ha na Mosis kparịtaa ụka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.