Ọpụpụ 34

Mgbe Mosis gwachara ha okwu, o weere akwa kpuchie ihu ya.

Exodus 34:33 (UKJV) And till Moses had done speaking with them, he put a vail on his face.

31Ma Mosis kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Nʼihi ya, Erọn na ndị ndu nzukọ Izrel bịara ka ha na Mosis kparịtaa ụka.

32Mgbe e mesịrị, ndị Izrel niile bịakwutere ya. O nyekwara ha iwu ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ya nʼelu ugwu Saịnaị.

33Mgbe Mosis gwachara ha okwu, o weere akwa kpuchie ihu ya.

34Ma mgbe ọbụla ọ na-abanye nʼihu Onyenwe anyị ka ha kparịtaa ụka nʼime ụlọ nzute ahụ, ọ na-ekepụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya tutu ruo mgbe ọ nọchara pụta. Mgbe ọ pụtara, ọ na-agwa ndị Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

35Ha hụkwara na ihu ya na akpụkpọ ihu ya na-egbuke egbuke. Emesịa, Mosis na-ekpuchikwa ihu ya tutu ruo mgbe ọ ga-abanye nʼime ka ya na Onyenwe anyị kparịta ụka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.