33Mgbe Mosis gwachara ha okwu, o weere akwa kpuchie ihu ya.
34Ma mgbe ọbụla ọ na-abanye nʼihu Onyenwe anyị ka ha kparịtaa ụka nʼime ụlọ nzute ahụ, ọ na-ekepụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya tutu ruo mgbe ọ nọchara pụta. Mgbe ọ pụtara, ọ na-agwa ndị Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
35Ha hụkwara na ihu ya na akpụkpọ ihu ya na-egbuke egbuke. Emesịa, Mosis na-ekpuchikwa ihu ya tutu ruo mgbe ọ ga-abanye nʼime ka ya na Onyenwe anyị kparịta ụka.