Ọpụpụ 35

nʼebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na mkpara ya. Mmanụ nsọ ahụ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke e ji ụda mee; akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ nke dị nʼebe mbata ụlọ nzute ahụ;

Exodus 35:15 (UKJV) And the incense altar, and his staves, and the anointing oil, and the sweet incense, and the hanging for the door at the entering in of the tabernacle,

13na tebul ahụ, na mkpara e ji ebu ya, na ngwongwo ya niile, na achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị.

14Mekwaa ebe ịdọkwasị oriọna maka ìhè, ya na ngwongwo ya niile, iheọkụ na mmanụ maka ịmụ ọkụ;

15nʼebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na mkpara ya. Mmanụ nsọ ahụ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke e ji ụda mee; akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ nke dị nʼebe mbata ụlọ nzute ahụ;

16ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ya na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara e ji ebu ya na ngwongwo ya niile, efere ukwu ahụ na ihe ndọkwasị ya.

17Akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ na ogidi ha, na ihe ndọkwasị ya, nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.