12Rụkwanụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na mkpara ahụ e ji ebu ya. Ya na oche ebere ahụ. Mekwaanụ akwa mgbochi nke ga-ekpuchi ebe nsọ ahụ,
13na tebul ahụ, na mkpara e ji ebu ya, na ngwongwo ya niile, na achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị.
14Mekwaa ebe ịdọkwasị oriọna maka ìhè, ya na ngwongwo ya niile, iheọkụ na mmanụ maka ịmụ ọkụ;
15nʼebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na mkpara ya. Mmanụ nsọ ahụ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke e ji ụda mee; akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ nke dị nʼebe mbata ụlọ nzute ahụ;
16ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ya na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara e ji ebu ya na ngwongwo ya niile, efere ukwu ahụ na ihe ndọkwasị ya.