Ọpụpụ 35

Ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz,

Exodus 35:32 (UKJV) And to devise curious works, to work in gold, and in silver, and in brass,

30Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel, sị, “Lee, Onyenwe anyị ahọpụtala Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda.

31O mejupụtala na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta na ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche.

32Ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz,

33ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi nakwa ọrụ ǹka niile dị iche iche.

34Ma o tinyela nʼime ya na Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, amara ikuziri ndị ọzọ ihe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.