Ọpụpụ 35

ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi nakwa ọrụ ǹka niile dị iche iche.

Exodus 35:33 (UKJV) And in the cutting of stones, to set them, and in carving of wood, to make any manner of cunning work.

31O mejupụtala na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta na ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche.

32Ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz,

33ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi nakwa ọrụ ǹka niile dị iche iche.

34Ma o tinyela nʼime ya na Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, amara ikuziri ndị ọzọ ihe.

35O mejupụtala ha nʼike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche, dịka igbunye akara, ise ihe osise, ịkpanye ihe ịchọ mma nʼakwa dị iche iche, ya bụ iji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa nʼezi akwa ọcha na nke ndị ọkpa akwa. Ha niile bụkwa ndị ǹka na ndị nchepụta ihe ịchọ mma doro anya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.