8Ndị niile mara ǹka nʼetiti ndị ọrụ ahụ ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie wuo ụlọ nzute ahụ. Onye ọka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha.
9Akwa mgbochi ndị a ha nʼotu. Ịdị ogologo ha nʼotu nʼotu bụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ha bụ otu mita na sentimita asatọ.
10E jikọtara akwa mgbochi ise nʼotu, jikọtakwa akwa ise nke ọzọ nʼotu.
11Ha ji akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka emekwara menyekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.
12Ha dụnyere iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ, mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.