9Akwa mgbochi ndị a ha nʼotu. Ịdị ogologo ha nʼotu nʼotu bụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ha bụ otu mita na sentimita asatọ.
10E jikọtara akwa mgbochi ise nʼotu, jikọtakwa akwa ise nke ọzọ nʼotu.
11Ha ji akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka emekwara menyekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.
12Ha dụnyere iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ, mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.
13Emesịa, ha ji iri nko ọlaedo ise jikọta ụzọ akwa mgbochi abụọ ndị a, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ ghọọ otu.