Ọpụpụ 36

Ha ji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.

Exodus 36:14 (UKJV) And he made curtains of goats' hair for the tent over the tabernacle: eleven curtains he made them.

12Ha dụnyere iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ, mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.

13Emesịa, ha ji iri nko ọlaedo ise jikọta ụzọ akwa mgbochi abụọ ndị a, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ ghọọ otu.

14Ha ji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.

15Akwa mgbochi iri na otu ndị a ha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo, ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ.

16Ha dụkọtara ise nʼime akwa mgbochi ahụ, debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.