Ọpụpụ 36

Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Bezalel na Oholiab na ndị ǹka ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ike na nghọta, ndị wepụtara obi ha ịbịa ịrụ ọrụ ahụ.

Exodus 36:2 (UKJV) And Moses called Bezaleel and Aholiab, and every wise hearted man, in whose heart the LORD had put wisdom, even every one whose heart stirred him up to come unto the work to do it:

1Ya mere, Bezalel na Oholiab na ndị ǹka niile Onyenwe anyị nyere ike na nghọta ịmata otu ha ga-esi rụọ ọrụ iwu ebe nsọ ahụ ga-arụ ọrụ ahụ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.

2Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Bezalel na Oholiab na ndị ǹka ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ike na nghọta, ndị wepụtara obi ha ịbịa ịrụ ọrụ ahụ.

3Ha si nʼaka Mosis nara onyinye ndị ahụ niile ụmụ Izrel wetara maka ịrụ ọrụ ebe nsọ ahụ. Ndị mmadụ nọkwa na-eweta onyinye afọ ofufu ha ụtụtụ niile.

4Nʼihi ya, ndị ọrụ ǹka niile nọ na-arụ ọrụ nʼebe nsọ ahụ hapụrụ ọrụ ha na-arụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.