19Mgbe ahụ, ha ji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ịkpụkwasị nʼelu ya.
20Ha meere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.
21Mbudo ibo ọ bụla dị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara,
22nwee ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ha rụrụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.
23Ha rụrụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ,