Ọpụpụ 36

Nʼakụkụ nke ọzọ bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ha rụkwara iri mbudo ibo abụọ,

Exodus 36:25 (UKJV) And for the other side of the tabernacle, which is toward the north corner, he made twenty boards,

23Ha rụrụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ,

24ma mekwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.

25Nʼakụkụ nke ọzọ bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ha rụkwara iri mbudo ibo abụọ,

26rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.

27Nʼebe isi isi nsọtụ ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ha rụrụ mbudo ibo isii.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.