Ọpụpụ 36

Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee akwa mgbochi. Onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.

Exodus 36:35 (UKJV) And he made a vail of blue, and purple, and scarlet, and fine twined linen: with cherubims made he it of cunning work.

33Ha mere osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ka ọ gabiga site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.

34Ha ji ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile. Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta mkpọrọ osisi ahụ niile. Ha ji ọlaedo machiekwa mkpọrọ osisi ndị ahụ niile.

35Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee akwa mgbochi. Onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.

36Ha mere ogidi osisi akashia anọ maka ya were ọlaedo machie ha. Ha meere ha anya nko; wukwara ha ụkwụ ọlaọcha anọ.

37Ha mere akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ, nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.