35Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee akwa mgbochi. Onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
36Ha mere ogidi osisi akashia anọ maka ya were ọlaedo machie ha. Ha meere ha anya nko; wukwara ha ụkwụ ọlaọcha anọ.
37Ha mere akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ, nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
38Ha rụrụ ogidi ise ya na anya nko ha. Ha ji ọlaedo machie isi ogidi ahụ na ihe mkpọrọ ha, were bronz rụọ ụkwụ ise ha.