Ọpụpụ 37

Alaka isii sitere nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ.

Exodus 37:18 (UKJV) And six branches going out of the sides thereof; three branches of the candlestick out of the one side thereof, and three branches of the candlestick out of the other side thereof:

16O mekwara ihe niile na-adị nʼelu tebul ahụ: efere, ngaji, ọkwa na iko, nke e ji awụpụ aja ihe ọṅụṅụ. Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka o ji kpụọ ha.

17Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Ha kpụrụ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mekwaa ka iko ya niile yiri okoko osisi, nʼisi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.

18Alaka isii sitere nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ.

19Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile dịkwa nʼotu alaka; iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ.

20Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, enwere iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.