Ọpụpụ 37

O mekwara ihe niile na-adị nʼelu tebul ahụ: efere, ngaji, ọkwa na iko, nke e ji awụpụ aja ihe ọṅụṅụ. Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka o ji kpụọ ha.

Exodus 37:16 (UKJV) And he made the vessels which were upon the table, his dishes, and his spoons, and his bowls, and his covers to cover likewise, of pure gold.

14E tinyere mgbaaka ndị ahụ nso nso ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, e ji ebu tebul ahụ.

15O jikwa osisi akashia mee okporo osisi ahụ e ji ebu tebul ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ya.

16O mekwara ihe niile na-adị nʼelu tebul ahụ: efere, ngaji, ọkwa na iko, nke e ji awụpụ aja ihe ọṅụṅụ. Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka o ji kpụọ ha.

17Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Ha kpụrụ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mekwaa ka iko ya niile yiri okoko osisi, nʼisi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.

18Alaka isii sitere nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.