12A rụnyere ihe nʼọnụ ọnụ tebul ahụ nke ịla elu ya ga-eru sentimita asatọ. Ihe a dị gburugburu ọnụ ọnụ tebul ahụ, ọ bụkwa ọlaedo a kpụrụ akpụ ka e ji rụọ ya.
13Ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ; kwụnyekwa ha nʼakụkụ anọ ahụ nʼebe ụkwụ anọ ya dị.
14E tinyere mgbaaka ndị ahụ nso nso ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, e ji ebu tebul ahụ.
15O jikwa osisi akashia mee okporo osisi ahụ e ji ebu tebul ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ya.
16O mekwara ihe niile na-adị nʼelu tebul ahụ: efere, ngaji, ọkwa na iko, nke e ji awụpụ aja ihe ọṅụṅụ. Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka o ji kpụọ ha.