Ọpụpụ 37

Ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ; kwụnyekwa ha nʼakụkụ anọ ahụ nʼebe ụkwụ anọ ya dị.

Exodus 37:13 (UKJV) And he cast for it four rings of gold, and put the rings upon the four corners that were in the four feet thereof.

11Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji machie ya. A kpụnyekwara ihe ọkpụkpụ ọlaedo gburugburu ọnụ ọnụ ya.

12A rụnyere ihe nʼọnụ ọnụ tebul ahụ nke ịla elu ya ga-eru sentimita asatọ. Ihe a dị gburugburu ọnụ ọnụ tebul ahụ, ọ bụkwa ọlaedo a kpụrụ akpụ ka e ji rụọ ya.

13Ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ; kwụnyekwa ha nʼakụkụ anọ ahụ nʼebe ụkwụ anọ ya dị.

14E tinyere mgbaaka ndị ahụ nso nso ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, e ji ebu tebul ahụ.

15O jikwa osisi akashia mee okporo osisi ahụ e ji ebu tebul ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.