Ọpụpụ 37

A rụnyere ihe nʼọnụ ọnụ tebul ahụ nke ịla elu ya ga-eru sentimita asatọ. Ihe a dị gburugburu ọnụ ọnụ tebul ahụ, ọ bụkwa ọlaedo a kpụrụ akpụ ka e ji rụọ ya.

Exodus 37:12 (UKJV) Also he made thereunto a border of an handbreadth round about; and made a crown of gold for the border thereof round about.

10Emesịa, o mere tebul nke ịdị ogologo ya bụ iri sentimita itoolu. Obosara ya bụ iri sentimita ise, ịla elu ya bụ iri sentimita asaa. Ọ bụ osisi akashia ka o ji mee ya.

11Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji machie ya. A kpụnyekwara ihe ọkpụkpụ ọlaedo gburugburu ọnụ ọnụ ya.

12A rụnyere ihe nʼọnụ ọnụ tebul ahụ nke ịla elu ya ga-eru sentimita asatọ. Ihe a dị gburugburu ọnụ ọnụ tebul ahụ, ọ bụkwa ọlaedo a kpụrụ akpụ ka e ji rụọ ya.

13Ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ; kwụnyekwa ha nʼakụkụ anọ ahụ nʼebe ụkwụ anọ ya dị.

14E tinyere mgbaaka ndị ahụ nso nso ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, e ji ebu tebul ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.