20Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, enwere iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya.
21Otu isi dị nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta, isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ, isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii.
22Isi nwapụta ya na alaka ya niile dịkọtara ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ.
23Ha mekwara oriọna asaa ya, ma mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile. Ha bụ ọlaedo a nụchara anụcha.
24Ha sitere na iri kilogram atọ na anọ nke ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ya niile.