23Ha mekwara oriọna asaa ya, ma mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile. Ha bụ ọlaedo a nụchara anụcha.
24Ha sitere na iri kilogram atọ na anọ nke ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ya niile.
25Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja a na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Akụkụ anọ ya ha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya bụ iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya bụ iri sentimita itoolu. Mpi ya niile si na ya pụta.
26Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya; akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ha jikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu.
27Ha kpụnyere mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọ bụla, ebe a ga na-ejide mkpara e ji ebu ya.