10Iri ogidi abụọ ga-adị na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ. Anya nko ogidi ndị ahụ ha na ihe ikegide ha ga-abụ ọlaọcha.
11Otu a kwa, akụkụ ugwu dịkwa iri mita anọ na ise. O nwere iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
12Akụkụ ọdịda anyanwụ dị iri mita abụọ na atọ. Nwekwaa akwa mgbochi, nwere ogidi iri na ebe ndọkwasị iri, tinyere anya nko ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
13Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite dịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara.
14Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ bụ ihe dị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.