Ọpụpụ 38

Ọ bụ ogidi anọ ka e ji jidesie ha ike na ihe ndọkwasị bronz anọ, nko na okporo osisi ha niile bụ ọlaọcha. E jikwa ọlaọcha machie isi ogidi ndị ahụ.

Exodus 38:19 (UKJV) And their pillars were four, and their sockets of brass four; their hooks of silver, and the overlaying of their capitals and their fillets of silver.

17Ogidi ọbụla nwere ihe ndọkwasị bronz. Nko niile na ihe njikọta niile ka e jikwa ọlaọcha machie. Ọ bụkwa naanị ọlaọcha ka e ji mee okporo osisi ndị ahụ.

18Akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ bụ ihe e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee; akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ dị mita itoolu nʼogologo, yikwaa akwa mgbochi nke ebe ogige ahụ, dị mita abụọ na iri sentimita atọ nʼịdị elu.

19Ọ bụ ogidi anọ ka e ji jidesie ha ike na ihe ndọkwasị bronz anọ, nko na okporo osisi ha niile bụ ọlaọcha. E jikwa ọlaọcha machie isi ogidi ndị ahụ.

20Ǹtu niile nke ụlọ nzute ahụ nakwa nʼogige ya gburugburu bụ bronz ka e ji kpụọ ha.

21Ndị a bụ ngwongwo niile e ji wuo ụlọ nzute ahụ; ebe a ga-edebe Ihe Ama ahụ. Ọ bụ ndị Livayị depụtara ihe niile ndị a nʼusoro dịka Mosis si nye ha nʼiwu. Ọ bụkwa Itama, nwa Erọn onye nchụaja, lekọtara ndị niile rụrụ ọrụ idekọta ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.