Ọpụpụ 38

Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, rụzuru ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.

Exodus 38:22 (UKJV) And Bezaleel the son Uri, the son of Hur, of the tribe of Judah, made all that the LORD commanded Moses.

20Ǹtu niile nke ụlọ nzute ahụ nakwa nʼogige ya gburugburu bụ bronz ka e ji kpụọ ha.

21Ndị a bụ ngwongwo niile e ji wuo ụlọ nzute ahụ; ebe a ga-edebe Ihe Ama ahụ. Ọ bụ ndị Livayị depụtara ihe niile ndị a nʼusoro dịka Mosis si nye ha nʼiwu. Ọ bụkwa Itama, nwa Erọn onye nchụaja, lekọtara ndị niile rụrụ ọrụ idekọta ya.

22Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, rụzuru ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.

23Onye na-enyere ya aka bụ Oholiab nwa Ahisamak, onye ebo Dan, bụ onye ọka a maara aha ya, ọ bụ onye ọka ihe ọtụtụ, na onye ọka ịdụnye ihe ịchọ mma dị iche iche nʼakwa na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha.

24Ịdị arọ nke onyinye ọlaedo niile sitere nʼaja mfufe ahụ nke ndị mmadụ wetara maka ịrụ ebe nsọ ahụ, bụ otu puku na narị kilogram ise.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.