Ọpụpụ 38

Ịdị arọ nke onyinye ọlaedo niile sitere nʼaja mfufe ahụ nke ndị mmadụ wetara maka ịrụ ebe nsọ ahụ, bụ otu puku na narị kilogram ise.

Exodus 38:24 (UKJV) All the gold that was occupied for the work in all the work of the holy place, even the gold of the offering, was twenty and nine talents, and seven hundred and thirty shekels, after the shekel of the sanctuary.

22Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, rụzuru ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.

23Onye na-enyere ya aka bụ Oholiab nwa Ahisamak, onye ebo Dan, bụ onye ọka a maara aha ya, ọ bụ onye ọka ihe ọtụtụ, na onye ọka ịdụnye ihe ịchọ mma dị iche iche nʼakwa na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha.

24Ịdị arọ nke onyinye ọlaedo niile sitere nʼaja mfufe ahụ nke ndị mmadụ wetara maka ịrụ ebe nsọ ahụ, bụ otu puku na narị kilogram ise.

25Ịdị arọ nke ọlaọcha enwetara nʼaka ọgbakọ ahụ, bụ puku kilogram anọ, na narị kilogram isii na iri ise dịka shekel ebe nsọ si dị.

26Ha niile tụrụ otu beka, otu isi, dịka ụtụ mgbe e kere ụtụ ọkara shekel dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị, e nyere nʼisi onye ọbụla nke gabigara nʼebe ndị a gụrụ ọnụ nọ, bụ ndị gbara iri afọ abụọ rigoo. Ọnụọgụgụ ha dị narị isii, na puku atọ, na narị ise, na iri ise.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.