Ọpụpụ 38

Ịdị arọ nke ọlaọcha enwetara nʼaka ọgbakọ ahụ, bụ puku kilogram anọ, na narị kilogram isii na iri ise dịka shekel ebe nsọ si dị.

Exodus 38:25 (UKJV) And the silver of them that were numbered of the congregation was an hundred talents, and a thousand seven hundred and threescore and fifteen shekels, after the shekel of the sanctuary:

23Onye na-enyere ya aka bụ Oholiab nwa Ahisamak, onye ebo Dan, bụ onye ọka a maara aha ya, ọ bụ onye ọka ihe ọtụtụ, na onye ọka ịdụnye ihe ịchọ mma dị iche iche nʼakwa na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha.

24Ịdị arọ nke onyinye ọlaedo niile sitere nʼaja mfufe ahụ nke ndị mmadụ wetara maka ịrụ ebe nsọ ahụ, bụ otu puku na narị kilogram ise.

25Ịdị arọ nke ọlaọcha enwetara nʼaka ọgbakọ ahụ, bụ puku kilogram anọ, na narị kilogram isii na iri ise dịka shekel ebe nsọ si dị.

26Ha niile tụrụ otu beka, otu isi, dịka ụtụ mgbe e kere ụtụ ọkara shekel dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị, e nyere nʼisi onye ọbụla nke gabigara nʼebe ndị a gụrụ ọnụ nọ, bụ ndị gbara iri afọ abụọ rigoo. Ọnụọgụgụ ha dị narị isii, na puku atọ, na narị ise, na iri ise.

27Ịdị arọ nke ọlaọcha niile e ji rụọ ụkwụ ibo niile nke ebe nsọ ahụ, na ụkwụ ogidi niile e ji jidesie akwa mgbochi ndị ahụ ike bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram isii. Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji wuo ụkwụ ọbụla bụ iri kilogram atọ na isii.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.