14Ha dị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
15Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi.
16Ha mere ihe ọlaedo abụọ nke a kpara akpa, ya na mgbaaka ọlaedo abụọ. Dụnyekwa mgbaaka ndị ahụ na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ.
17Ha dụnyere ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ.
18Were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa. Konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya.