Ọpụpụ 39

Mgbe ahụ, ha kenyere ya eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.

Exodus 39:31 (UKJV) And they tied unto it a lace of blue, to fasten it on high upon the turban; as the LORD commanded Moses.

29Ihe ike nʼukwu bụ nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie uhie, na uhie uhie, nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.

30Ha mere efere, bụ okpu nsọ ahụ, site nʼọlaedo a nụchara anụcha, gbunyekwa akara nʼelu ya, dịka ihe e dere nʼelu mgbaaka akara: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.

31Mgbe ahụ, ha kenyere ya eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.

32Otu a ka ha si rụchaa ọrụ iwu ụlọ nzute ahụ. Ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.

33Mgbe ahụ, ha buteere Mosis ụlọ nzute ahụ: ụlọ ikwu ahụ ya na ngwongwo ya niile, ya bụ nko ya niile, mbudo ibo ya niile, mkpọrọ osisi ya niile, ogidi ya niile na ụkwụ ya niile,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.