30Ha mere efere, bụ okpu nsọ ahụ, site nʼọlaedo a nụchara anụcha, gbunyekwa akara nʼelu ya, dịka ihe e dere nʼelu mgbaaka akara: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
31Mgbe ahụ, ha kenyere ya eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
32Otu a ka ha si rụchaa ọrụ iwu ụlọ nzute ahụ. Ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
33Mgbe ahụ, ha buteere Mosis ụlọ nzute ahụ: ụlọ ikwu ahụ ya na ngwongwo ya niile, ya bụ nko ya niile, mbudo ibo ya niile, mkpọrọ osisi ya niile, ogidi ya niile na ụkwụ ya niile,
34na akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri e ji emechi elu ụlọ nzute ahụ, na akwa mgbochi,