Ọpụpụ 39

Ha dụrụ akwa na-adị nʼubu maka efọọd ahụ, nke e jikọtara na nkuku ya abụọ, maka i ji na-ekechisi ya ike.

Exodus 39:4 (UKJV) They made shoulder pieces for it, to couple it together: by the two edges was it coupled together.

2Ha ji ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, na nke na-acha uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ.

3Ha tipịara mpempe ọlaedo ndị ahụ mee ka ọ dị mbadamba. Bipụtasịa ha ntakịrị ntakịrị dịka eriri maka i ji ha kpanye nʼetiti ogho ndị a na-acha anụnụ anụnụ; ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka.

4Ha dụrụ akwa na-adị nʼubu maka efọọd ahụ, nke e jikọtara na nkuku ya abụọ, maka i ji na-ekechisi ya ike.

5Ihe okike nke ukwu ahụ, nke onye ǹka kpaziri nke ọma yiri ya, ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

6Ha doziri nkume ọniks ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa; ma gbunye aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu ya dịka onye ọka si egbunye aha mmadụ nʼelu mgbaaka akara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.