41na uwe niile a kpara akpa, nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja, na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja.
42Ndị Izrel niile rụzuru ọrụ ndị a niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.
43Mosis nʼonwe ya hụkwara ọrụ ndị a niile, nabata ya ka nke e jere dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị. Nʼihi ya, Mosis gọziri ha.