Ọpụpụ 4

Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.”

Exodus 4:10 (UKJV) And Moses said unto the LORD, O my LORD, I am not eloquent, neither in time past, nor since you have spoken unto your servant: but I am slow of speech, and of a slow tongue.

8Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ekweghị gị maọbụ nabata ihe ama nke mbụ, ha ga-ekwe ihe ịrịbama nke abụọ a.

9Ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị nʼihe ịrịbama abụọ ndị a ma ọ bụkwanụ gee gị ntị; kute mmiri nʼosimiri Naịl, wụpụ ya nʼala akọrọ. Mmiri ahụ nke i kutere site nʼosimiri ga-agbanwe, ghọọ ọbara nʼala akọrọ.”

10Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.”

11Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere ọnụ mmadụ? Onye na-emekwa ka ntị mmadụ chie ya, maọbụ ka mmadụ daa ogbi? Onye na-eme ka mmadụ hụ ụzọ, maọbụ kpụọ ìsì? Ọ bụghị mụ onwe m bụ Onyenwe anyị?

12Ugbu a, gaa mee ihe m gwara gị. Aga m enyere gị aka ikwu okwu nke ọma. Aga m agwakwa gị ihe ị ga-ekwu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.