6Onyenwe anyị gwara ya okwu ọzọ sị, “Tinye aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mgbe Mosis tinyere aka ya wepụta ya, ọ chọpụtara na ekpenta jupụtara nʼaka ahụ nke na-enwu ezi ọcha.
7Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Tinyekwa aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mosis mere otu a. Mgbe o wepụtara aka ya ọzọ, ọ hụrụ na ọ dịghachiri dịka akụkụ anụ ahụ ya ndị ọzọ.
8Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ekweghị gị maọbụ nabata ihe ama nke mbụ, ha ga-ekwe ihe ịrịbama nke abụọ a.
9Ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị nʼihe ịrịbama abụọ ndị a ma ọ bụkwanụ gee gị ntị; kute mmiri nʼosimiri Naịl, wụpụ ya nʼala akọrọ. Mmiri ahụ nke i kutere site nʼosimiri ga-agbanwe, ghọọ ọbara nʼala akọrọ.”
10Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.”