Ọpụpụ 4

Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Mosis sị ya, “Kedụ maka nwanne gị nwoke Erọn onye Livayị, amaara m na ọ bụ onye ọka okwu. Lee, ọ na-abịa izute gị. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara gị.

Exodus 4:14 (UKJV) And the anger of the LORD was kindled against Moses, and he said, Is not Aaron the Levite your brother? I know that he can speak well. And also, behold, he comes forth to meet you: and when he sees you, he will be glad in his heart.

12Ugbu a, gaa mee ihe m gwara gị. Aga m enyere gị aka ikwu okwu nke ọma. Aga m agwakwa gị ihe ị ga-ekwu.”

13Ma ọ rịọrọ, “Biko Onyenwe m, ziganụ onye ọzọ.”

14Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Mosis sị ya, “Kedụ maka nwanne gị nwoke Erọn onye Livayị, amaara m na ọ bụ onye ọka okwu. Lee, ọ na-abịa izute gị. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara gị.

15Ị ga-agwa ya okwu, tinye okwu gị nʼọnụ ya. Aga m enyere unu abụọ aka ikwu okwu nke ọma, aga m ezikwa unu abụọ ihe unu ga-eme.

16Ọ ga-abụ onye na-ekwuchite ọnụ gị nʼebe ndị mmadụ nọ. Ị ga-anọ dịka Chineke nʼebe ọ nọ, nʼihi na ị ga-agwa ya ihe niile ọ ga-ekwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.