14Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Mosis sị ya, “Kedụ maka nwanne gị nwoke Erọn onye Livayị, amaara m na ọ bụ onye ọka okwu. Lee, ọ na-abịa izute gị. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara gị.
15Ị ga-agwa ya okwu, tinye okwu gị nʼọnụ ya. Aga m enyere unu abụọ aka ikwu okwu nke ọma, aga m ezikwa unu abụọ ihe unu ga-eme.
16Ọ ga-abụ onye na-ekwuchite ọnụ gị nʼebe ndị mmadụ nọ. Ị ga-anọ dịka Chineke nʼebe ọ nọ, nʼihi na ị ga-agwa ya ihe niile ọ ga-ekwu.
17Ma ị ga-ejide mkpanaka a dị nʼaka gị ka i nwee ike jiri ya mee ihe ịrịbama.”
18Emesịa, Mosis lọghachiri nʼụlọ ebe o bi, jekwuru Jetro ọgọ ya nwoke rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m laghachi nʼIjipt gaa chọpụta ma o nwere ndị ikwu m ka dị ndụ.” Jetro sịrị, “Gaa nʼudo.”