Ọpụpụ 4

Ma ị ga-ejide mkpanaka a dị nʼaka gị ka i nwee ike jiri ya mee ihe ịrịbama.”

Exodus 4:17 (UKJV) And you shall take this rod in yours hand, wherewith you shall do signs.

15Ị ga-agwa ya okwu, tinye okwu gị nʼọnụ ya. Aga m enyere unu abụọ aka ikwu okwu nke ọma, aga m ezikwa unu abụọ ihe unu ga-eme.

16Ọ ga-abụ onye na-ekwuchite ọnụ gị nʼebe ndị mmadụ nọ. Ị ga-anọ dịka Chineke nʼebe ọ nọ, nʼihi na ị ga-agwa ya ihe niile ọ ga-ekwu.

17Ma ị ga-ejide mkpanaka a dị nʼaka gị ka i nwee ike jiri ya mee ihe ịrịbama.”

18Emesịa, Mosis lọghachiri nʼụlọ ebe o bi, jekwuru Jetro ọgọ ya nwoke rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m laghachi nʼIjipt gaa chọpụta ma o nwere ndị ikwu m ka dị ndụ.” Jetro sịrị, “Gaa nʼudo.”

19Ugbu a Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼala Midia sị ya, “Laghachi Ijipt nʼihi na ndị niile chọrọ igbu gị anwụchaala.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.